Native Bible

Psalms 110:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.

Psalms 110:3 in English

Psalms 110:3 · Berean Standard Bible

Your people shall be willing on Your day of battle. Arrayed in holy splendor, from the womb of the dawn, to You belongs the dew of Your youth.

Context

1Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”* 2Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. 3Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 4Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.” 5Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.