Abụ Ọma 106:8
Psalms 106:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
Psalms 106:8 in English
Psalms 106:8 · Berean Standard Bible
Yet He saved them for the sake of His name, to make His power known.
Context
6Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere;
anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume. 7Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt,
ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile;
ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile,
kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie. 8Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya,
ime ka a mara ike ya dị ukwuu. 9Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa;
o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara. 10Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị;
gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.