Native Bible

Psalms 106:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.

Psalms 106:8 in English

Psalms 106:8 · Berean Standard Bible

Yet He saved them for the sake of His name, to make His power known.

Context

6Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume. 7Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie. 8Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu. 9Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara. 10Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.