Abụ Ọma 106:7
Psalms 106:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
Psalms 106:7 in English
Psalms 106:7 · Berean Standard Bible
Our fathers in Egypt did not grasp Your wonders or remember Your abundant kindness; but they rebelled by the sea, there at the Red Sea.*
Context
5ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara,
ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị
sorokwa ihe nketa gị nye otuto. 6Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere;
anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume. 7Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt,
ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile;
ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile,
kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie. 8Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya,
ime ka a mara ike ya dị ukwuu. 9Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa;
o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.