Abụ Ọma 105:9
Psalms 105:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
Psalms 105:9 in English
Psalms 105:9 · Berean Standard Bible
the covenant He made with Abraham, and the oath He swore to Isaac.
Context
7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
ikpe ya dị nʼụwa niile. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,
bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara
na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik. 10O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi: 11“Aga m enye gị ala Kenan
dịka oke i ga-eketa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.