Ilu 7:13
Proverbs 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
Proverbs 7:13 in English
Proverbs 7:13 · Berean Standard Bible
She seizes him and kisses him; she brazenly says to him:
Context
11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.
Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya. 12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;
na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.) 13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,
were ihu nke ihere na-adịghị, sị: 14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa,
enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m, 15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,
lee gị ka ị na-abịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.