Proverbs 5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,
gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a. 2Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,
ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.* 3Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,
okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ. 4Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu
dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ. 5Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,
nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. 6Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;
ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a. 7Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,
unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu. 8Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!
Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso, 9ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,
maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere. 10Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,
ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ. 11Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ
mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị. 12Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!
“Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya! 13Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m
maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m. 14Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi
nʼihu ọha mmadụ niile.” 15Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;
mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị. 16Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,
ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama? 17Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,
nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya. 18Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị. 19Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
ka ara dị ya nʼobi zuore gị,
ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla. 20Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?
Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi? 21Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,
ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ. 22Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;
mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya. 23Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;
ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.
5:2 Mal 2:7
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.