Native Bible

Proverbs 31:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”

Proverbs 31:29 in English

Proverbs 31:29 · Berean Standard Bible

“Many daughters have done noble things, but you surpass them all!”

Context

27Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ. 28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto. 29Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.” 30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito. 31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. 31:3 Okwu a, ụmụ nwanyị, bụ banyere ọtụtụ ndị inyom bi nʼụlọeze. Onye dere akwụkwọ a, eleghị anya, na-arụtụ aka na ụmụ nwanyị ndị a, pụrụ ime ka uche eze pụọ site nʼihe o kwesiri ime. Est 2:3,8 31:10 Maọbụ, Nwanyị nwere agwa ọma na-ejidekwa onwe ya nʼụzọ kwesiri. 31:22 Nʼoge ochie, naanị ndị ọgaranya na-eyi uwe na-acha odo odo, nʼihi na ọ bụ akwa dị oke ọnụ. 31:23 Ọnụ ụzọ ama obodo bụ ebe ndị okenye na-ezukọta akparịta ụka. Jen 19:1; Rut 4:1-3

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.