Ilu 31:12
Proverbs 31:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
Proverbs 31:12 in English
Proverbs 31:12 · Berean Standard Bible
She brings him good and not harm all the days of her life.
Context
10Nwanyị nwere ugwu* onye ga-achọtali ya?
Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi. 11Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,
ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya. 12Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.
Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya. 13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi
jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ. 14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya
dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.