Ilu 3:22
Proverbs 3:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
Proverbs 3:22 in English
Proverbs 3:22 · Berean Standard Bible
They will be life to your soul and adornment to your neck.
Context
20Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile,
igwe ojii na-atụdakwa igirigi. 21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha:
amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, 22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ,
ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. 23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu
maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. 24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu,
ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.