Ilu 27:21
Proverbs 27:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
Proverbs 27:21 in English
Proverbs 27:21 · Berean Standard Bible
A crucible for silver and a furnace for gold, but a man is tested by the praise accorded him.
Context
19Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri
otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ. 20Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi,
otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. 21Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo
ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha. 22Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe,
were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka,
ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha. 23Lezie ọrụ gị anya nke ọma,
marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.