Ilu 27:17
Proverbs 27:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
Proverbs 27:17 in English
Proverbs 27:17 · Berean Standard Bible
As iron sharpens iron, so one man sharpens another.*
Context
15Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo
na nwanyị na-eso okwu bụ otu. 16Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe,
maọbụ were aka jide mmanụ. 17Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ,
otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ. 18Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya,
onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ. 19Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri
otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.