Native Bible

Proverbs 26:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.

Proverbs 26:20 in English

Proverbs 26:20 · Berean Standard Bible

Without wood, a fire goes out; without gossip, a conflict ceases.

Context

18Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ, 19ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.” 20Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ. 21Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ. 22Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.