Native Bible

Proverbs 25:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.

Proverbs 25:3 in English

Proverbs 25:3 · Berean Standard Bible

As the heavens are high and the earth is deep, so the hearts of kings cannot be searched.

Context

1Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ. 2Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu. 3Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta. 4Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere; 5wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.