Ilu 24:13
Proverbs 24:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
Proverbs 24:13 in English
Proverbs 24:13 · Berean Standard Bible
Eat honey, my son, for it is good, and the honeycomb is sweet to your taste.
Context
11Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ.
Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi. 12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,”
ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya?
Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya?
Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị? 13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma.
Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ. 14Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.
Ọ bụrụ na i chọta ya
i nwere olileanya nke ga-adịgide. 15Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume.
A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.