Ilu 24:14
Proverbs 24:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
Proverbs 24:14 in English
Proverbs 24:14 · Berean Standard Bible
Know therefore that wisdom is sweet to your soul. If you find it, there is a future for you, and your hope will never be cut off.
Context
12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,”
ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya?
Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya?
Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị? 13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma.
Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ. 14Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.
Ọ bụrụ na i chọta ya
i nwere olileanya nke ga-adịgide. 15Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume.
A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya. 16Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ.
Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.