Ilu 12:20
Proverbs 12:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
Proverbs 12:20 in English
Proverbs 12:20 · Berean Standard Bible
Deceit is in the hearts of those who devise evil, but the counselors of peace have joy.
Context
18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,
ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ. 19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,
ma okwu ụgha anaghị adịgide. 20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ;
ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ. 21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,
ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu. 22Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,
ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.