Native Bible

Proverbs 12:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.

Proverbs 12:16 in English

Proverbs 12:16 · Berean Standard Bible

A fool’s anger is known at once, but a prudent man overlooks an insult.

Context

14Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị. 15Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ. 16Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya. 17Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha. 18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.