Ilu 12:11
Proverbs 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
Proverbs 12:11 in English
Proverbs 12:11 · Berean Standard Bible
The one who works his land will have plenty of food, but whoever chases fantasies lacks judgment.
Context
9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,
karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya. 10Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,
ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere. 11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ. 12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,
ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto. 13A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya,
ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.