Ilu 12:10
Proverbs 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
Proverbs 12:10 in English
Proverbs 12:10 · Berean Standard Bible
A righteous man regards the life of his animal, but the tender mercies of the wicked are only cruelty.
Context
8Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ,
ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya. 9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,
karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya. 10Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,
ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere. 11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ. 12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,
ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.