Ilu 1:28
Proverbs 1:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
Proverbs 1:28 in English
Proverbs 1:28 · Berean Standard Bible
Then they will call on me, but I will not answer; they will earnestly seek me, but will not find me.
Context
26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.
Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo. 27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike,
mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe,
mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya. 28“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m.
Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m. 29Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị,
unu atụghị egwu Onyenwe anyị. 30Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m.
Unu lelịrị ịba mba m anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.