Ndị Filipai 1:3
Philippians 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
Philippians 1:3 in English
Philippians 1:3 · Berean Standard Bible
I thank my God every time I remember you.
Context
1Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs,
Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye* na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai. 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu. 4Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. 5Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.