Native Bible

Obadiah 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.

Obadiah 1:2 in English

Obadiah 1:2 · Berean Standard Bible

“Behold, I will make you small among the nations; you will be deeply despised.

Context

1Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.” 2“Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu. 3Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’ 4A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.