Native Bible

Obadiah 1:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.”

Obadiah 1:1 in English

Obadiah 1:1 · Berean Standard Bible

This is the vision of Obadiah: This is what the Lord GOD says about Edom— We have heard a message from the LORD; an envoy has been sent among the nations to say, “Rise up, and let us go to battle against her!”—

Context

1Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm. Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị, e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.” 2“Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche; ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu. 3Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.