Native Bible

Numbers 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka.

Numbers 7:13 in English

Numbers 7:13 · Berean Standard Bible

His offering was one silver platter weighing a hundred and thirty shekels,* and one silver bowl weighing seventy shekels,* both according to the sanctuary shekel and filled with fine flour mixed with oil for a grain offering;

Context

11Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.” 12Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ. 13Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka. 14O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. 15O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.