Native Bible

Numbers 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,

Numbers 4:17 in English

Numbers 4:17 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Moses and Aaron,

Context

15“Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.* 16“Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.” 17Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, 18“Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị. 19Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.