Ọnụọgụgụ 4:16
Numbers 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.”
Numbers 4:16 in English
Numbers 4:16 · Berean Standard Bible
Eleazar son of Aaron the priest shall oversee the oil for the light, the fragrant incense, the daily grain offering, and the anointing oil. He has oversight of the entire tabernacle and everything in it, including the holy objects and their utensils.”
Context
14Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị. 15“Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.* 16“Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.” 17Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, 18“Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.