Native Bible

Numbers 35:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.

Numbers 35:11 in English

Numbers 35:11 · Berean Standard Bible

designate cities to serve as your cities of refuge, so that a person who kills someone unintentionally may flee there.

Context

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 10“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan, 11họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama. 12Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ,* ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ. 13Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.