Native Bible

Numbers 35:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

Numbers 35:9 in English

Numbers 35:9 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Moses,

Context

7Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu. 8Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.” 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 10“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan, 11họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.