Native Bible

Numbers 35:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ,* ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.

Numbers 35:12 in English

Numbers 35:12 · Berean Standard Bible

You are to have these cities as a refuge from the avenger, so that the manslayer will not die until he stands trial before the assembly.

Context

10“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan, 11họpụtanụ ụfọdụ obodo ka ọ bụrụ obodo mgbaba ebe mmadụ nwere ike ịgbabanye ma ọ bụrụ na o gbuo mmadụ na-amaghị ama. 12Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ,* ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ. 13Obodo isii ndị a unu wepụtara ga-abụ obodo mgbaba. 14Họpụta obodo mgbaba atọ nʼakụkụ ọzọ nke Jọdan. Ka atọ ndị ọzọ dịrị na Kenan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.