Native Bible

Numbers 34:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ”

Numbers 34:12 in English

Numbers 34:12 · Berean Standard Bible

Then the border will go down along the Jordan and end at the Salt Sea. This will be your land, defined by its borders on all sides.”

Context

10Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam. 11Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili. 12Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ” 13Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ. 14Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.