Native Bible

Numbers 33:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.

Numbers 33:38 in English

Numbers 33:38 · Berean Standard Bible

At the LORD’s command, Aaron the priest climbed Mount Hor and died there on the first day of the fifth month, in the fortieth year after the Israelites had come out of the land of Egypt.

Context

36Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin. 37Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm. 38Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta. 39Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor. 40Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.