Ọnụọgụgụ 32:10
Numbers 32:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
Numbers 32:10 in English
Numbers 32:10 · Berean Standard Bible
So the anger of the LORD was kindled that day, and He swore an oath, saying,
Context
8Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ. 9Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha. 10Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị, 11‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’ 12Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz,* na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.