Native Bible

Numbers 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.

Numbers 32:9 in English

Numbers 32:9 · Berean Standard Bible

For when your fathers went up to the Valley of Eshcol and saw the land, they discouraged the Israelites from entering the land that the LORD had given them.

Context

7Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha? 8Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ. 9Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha. 10Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị, 11‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.