Ọnụọgụgụ 3:7
Numbers 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ.
Numbers 3:7 in English
Numbers 3:7 · Berean Standard Bible
They are to perform duties for him and for the whole congregation before the Tent of Meeting, attending to the service of the tabernacle.
Context
5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 6“Kpọkọtaa ebo Livayị* niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya. 7Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ. 8Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ. 9Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.