Native Bible

Numbers 3:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile.

Numbers 3:37 in English

Numbers 3:37 · Berean Standard Bible

as well as the posts of the surrounding courtyard with their bases, tent pegs, and ropes.

Context

35Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. 36Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha. 37Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile. 38Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom. Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile. Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu. 39Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.