Ọnụọgụgụ 27:4
Numbers 27:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
Numbers 27:4 in English
Numbers 27:4 · Berean Standard Bible
Why should the name of our father disappear from his clan because he had no sons? Give us property among our father’s brothers.”
Context
2nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị, 3“Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke. 4Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.” 5Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị. 6Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.