Ọnụọgụgụ 26:62
Numbers 26:62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.
Numbers 26:62 in English
Numbers 26:62 · Berean Standard Bible
The registration of the Levites totaled 23,000, every male a month old or more; they were not numbered among the other Israelites, because no inheritance was given to them among the Israelites.
Context
60Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama. 61Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.) 62Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha. 63Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko. 64Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.