Ọnụọgụgụ 26:64
Numbers 26:64 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
Numbers 26:64 in English
Numbers 26:64 · Berean Standard Bible
Among all these, however, there was not one who had been numbered by Moses and Aaron the priest when they counted the Israelites in the Wilderness of Sinai.
Context
62Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha. 63Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko. 64Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị. 65Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.