Ọnụọgụgụ 21:26
Numbers 21:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.
Numbers 21:26 in English
Numbers 21:26 · Berean Standard Bible
Heshbon was the city of Sihon king of the Amorites, who had fought against the former king of Moab and taken all his land as far as the Arnon.
Context
24Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa. 25Ndị Izrel lụgburu obodo niile nke ndị Amọrait bichie nʼime ha, tinyere Heshbọn na obodo nta niile gbara ya gburugburu. 26Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn. 27Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị,
“Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya,
ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike. 28“Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ.
Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn,
rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab,
ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.