Native Bible

Numbers 20:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.

Numbers 20:9 in English

Numbers 20:9 · Berean Standard Bible

So Moses took the staff from the LORD’s presence, just as he had been commanded.

Context

7Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 8“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.” 9Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị. 10Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?” 11Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.