Ọnụọgụgụ 20:11
Numbers 20:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
Numbers 20:11 in English
Numbers 20:11 · Berean Standard Bible
Then Moses raised his hand and struck the rock twice with his staff, so that a great amount of water gushed out, and the congregation and their livestock were able to drink.
Context
9Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị. 10Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?” 11Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri. 12Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.” 13A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba,* nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.