Ọnụọgụgụ 20:8
Numbers 20:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
Numbers 20:8 in English
Numbers 20:8 · Berean Standard Bible
“Take the staff and assemble the congregation. You and your brother Aaron are to speak to the rock while they watch, and it will pour out its water. You will bring out water from the rock and provide drink for the congregation and their livestock.”
Context
6Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya. 7Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 8“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.” 9Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị. 10Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.