Ọnụọgụgụ 20:3
Numbers 20:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
Numbers 20:3 in English
Numbers 20:3 · Berean Standard Bible
The people quarreled with Moses and said, “If only we had perished with our brothers before the LORD!
Context
1Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya. 2Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn. 3Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị. 4Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a? 5Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.