Native Bible

Numbers 20:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”

Numbers 20:5 in English

Numbers 20:5 · Berean Standard Bible

Why have you led us up out of Egypt to bring us to this wretched place? It is not a place of grain, figs, vines, or pomegranates—and there is no water to drink!”

Context

3Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị. 4Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a? 5Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.” 6Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya. 7Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.