Ọnụọgụgụ 20:2
Numbers 20:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
Numbers 20:2 in English
Numbers 20:2 · Berean Standard Bible
Now there was no water for the congregation, so they gathered against Moses and Aaron.
Context
1Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya. 2Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn. 3Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị. 4Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.