Ọnụọgụgụ 20:18
Numbers 20:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”
Numbers 20:18 in English
Numbers 20:18 · Berean Standard Bible
But Edom answered, “You may not travel through our land, or we will come out and confront you with the sword.”
Context
16Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt.
“Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị. 17Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.” 18Ma eze Edọm zara sị,
“Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.” 19Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya,
“Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.” 20Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị,
“Unu agaghị esite nʼala gabiga.”
Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.