Native Bible

Numbers 2:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.

Numbers 2:29 in English

Numbers 2:29 · Berean Standard Bible

Next will be the tribe of Naphtali. The leader of the Naphtalites is Ahira son of Enan,

Context

27Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran. 28Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500). 29Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan. 30Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 31Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.