Native Bible

Numbers 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).

Numbers 2:15 in English

Numbers 2:15 · Berean Standard Bible

and his division numbers 45,650.

Context

13Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300). 14Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.* 15Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650). 16Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije. 17Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.