Native Bible

Numbers 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye Onyenwe anyị bụ nke gị.

Numbers 18:14 in English

Numbers 18:14 · Berean Standard Bible

Every devoted thing in Israel belongs to you.

Context

12“Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara Onyenwe anyị. 13Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara Onyenwe anyị, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya. 14“Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye Onyenwe anyị bụ nke gị. 15Ihe niile e bụ ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụ ụlọ, nke e nyere Onyenwe anyị dịka onyinye, bụ nke gị. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ, na ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ ndị na-adịghị ọcha. 16Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.