Ọnụọgụgụ 17:9
Numbers 17:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya.
Numbers 17:9 in English
Numbers 17:9 · Berean Standard Bible
Then Moses brought out all the staffs from the LORD’s presence to all the Israelites. They saw them, and each man took his own staff.
Context
7Mosis chịịrị ha niile dozie ha nʼihu Onyenwe anyị nʼime ime ụlọ nzute Ihe Ama ahụ. 8Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd. 9Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya. 10Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ.” 11Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.